Igbo Paper 2 WASSCE (SC), 2022

Question 11


Candidates were requested to define oath taking “Ịnụ Iyi” in (a); in (b) state two reasons for taking oath; in (c) state four methods of oath taking and explain each briefly and in (d) state two sets of people exempted from taking oath.

The expected answers were as follows:
(a)       -           Ịṅụ iyi bụ ịkpọku ihe ofufe ka ọ bịa gbaa akaebe n’ihe a na-enwe mgbagha na
ya.
-           Ịṅụ iyi bụ mmadụ ịkpọku Chineke/Arụsị/Agbara/ ihe ofufe ka ọ gbaara ya akaebe gbasara ebubo e boro ya.
-           Ọ bụ ụzọ e si achọpụta eziokwu ka a ghara ilekwasị onye aka ya dị ọcha anya na o mere ihe o meghị.

(b)       -           Ebubo, - ịzọ ihe, - inyo mmadụ enyo, - ịchọ ihe furu efu, - esemokwu,
-nghọtahie/ mgbagha

(c)        -           Ịṅefe ozu: Mmadụ nwụọ, o nwee onye a na-enyo enyo, a sị ya bịa ṅefee ozu
onye ahụ.
-           Ịkpụrụ ọjị n’obi onye nwụrụ anwụ: Ịgwa onye a na-enyo enyo ka ọ kpụrụ ọjị e
dotere n’obi ozu ahụ.
-           Ịṅụ arụsị: Ịsị onye a na-enyo enyo ka ọ ṅụọ arụsị e butere maọbụ arụsị dị
n’okwu arụsị.
-           Ịṅụ mmiri ozu: Ịsị onye a na-enyo enyo ka ọ ṅụọ mmiri e ji saa ozu ahụ ahụ.
-           Ịkpụ ọjị ala: Ịga n’ihu mmụọ obodo gaa kpụrụ ọjị.
-           Ịtụ/ịma/ịkpọ iyi: Ịkpọta eze mmụọ ka o buru arụsị, gọrọ ọfọ gazuo obodo niile   mgbe a maghị onye e bu n’obi mere ihe ahụ.
-           Iṅefe ọfọ: Ịsị onye e boro ebubo ṅefee ọfọ a tọgbọrọ n’ala.
-           Ịracha ọfọ: Ịsị onye e boro ebubo jide ọfọ n’aka gọrọ onwe ya ma detụ ọfọ ahụ ire.
-           Ịkpọku Chukwu/Ọbasị: Onye e boro ebubo ịkpọku Chukwu ka ọ gbaara ya akaebe.
-           Ịṅụ iyi aja ala: Onye a na-enyo enyo ịgbara ụkwụ nkịtị, chịrị aja n’ala gọrọ onwe ya.

(d)       -           Ụmụaka
-           ụmụnwaanyị dị ime

 

The few candidates who answered this question tried but fumbled in (d) question.