Igbo Paper 2 WASSCE (SC), 2022

Question 10


This question was from a written drama titled Ọjaadịlị.
Candidates were asked to write down in (a) six words of Udumeje to Ọjaadịlị to encourage him to fight Otiaba in the market and in (b) four words of Ọjaadịlị to Ajiobu when Ajiobu reported to Ụmụngodo in the market that Chimpanzee caught Udumeje
These were the expected points:
(a)        -           O turu ya, ekwe mpu n’ikolo.
-           Ọ kpọrọ ya, Agamevu nwa ya.
-           Ọ sịrị na e jighị ya agwọ ajụ.
-           Ọ sịrị na e jighị ya ehi isi.
-           Ọ kpọrọ ya aha ya, kpọkwa ya Agamevu.
-           Ọ sịrị ya mata na mmiri dọ n’eju, dọọrọ nwa nkịta.
-           Ọ sị ya mata na ọkụkọ na-abụ oke, na-abụ n’eju mmiri.
-           Ọ sị ya na a naghị ekunyere nkịta abụọ mmiri n’otu eju.
-           Ọ sịrị na ekwe mpu ya na-etiku Ọjaadịlị.
-           Ọ kpọrọ Ọjaadịlị ikolo ya, sị ya na ngwere emeghị ihe o ji bụrụ ngwere, a kpọọ    ya ngwere ịkpa.
-           Ọ sịrị ya na mberede ka e ji ama dike.
-           O turu ya Agamevu dike.
-           O turu ya ori ọgọdọ a watara dike.
-           Ọ sịrị ya na e zu onye, e zu ihe o mere.         

(b)        -           Ọ sịrị ndị nọ ebe ahụ, ha aṅakwala Ajịobu ntị.
-           Ọ jụrụ ya ihe o che na ha bụ; ma o che na ha bụ ewu ka ọ bụ atụrụ.
-           Ọ gwara ya na ọ bụ ọgwụ ka o ji kpọrọ Ụdụmeje, pụọ.
-           Ọ gwara ya na ụkwụ nkịtị kpọọ Ụdụmeje, na ọ gaghị anọ ebe ahụ na-ekwu ihe ndị ahụ ọ na-ekwu. 
-           Ọ gwara ya ka ọ gaa gosi ya ebe Ụdụmeje nọ; ma o meghị, ya egosi ya ihe ndị   mmụọ ji ntị ewu eme.
-           Ọ jụrụ ya ihe ọ na-ekwugheri.
-           Ọ gwara ya na ọ bụ ya na Ụdụmeje si ebe ahụ pụọ.
-           Ọ sịrị ya gwa ya ebe Ụdụmeje nọ, kpọọ ya nwa nkịta.
-           Ọ gwara ya na ihe mee Ụdụmeje, na ya ga-eji aka dọkasịa ya, udele erie anụ ya.
Few candidates that attempted this question did not assimilate the story.