Igbo Paper 2 WASSCE (SC), 2023

Question 3

 

 

give one reason why some consonants are called double consonants, give examples of such consonants, state four (4) differences between consonants and vowels and state the manner of articulation of the front and back vowels.

Observation

Candidates were requested to give one reason why some consonants are called double consonants, give examples of such consonants, state four (4) differences between consonants and vowels and state the manner of articulation of the front and back vowels.
The candidates performed well in their responses.
The following points were expected:
(a) (i)   -     Ha bụ mkpụrụụda mgbochiume abụọ e wekọtara ọnụ ha ghọọ otu        
                    mkpụrụụda. 
  
                         -      Ha bụ mkpụrụedemede mgbochiume abụọ e dekọrọ ọnụ ma nwee otu ụda.
     (ii)          ch, gb, gh, gw, kp, kw, nw, ny, sh

(b) -     Anaghị enwe mgbochi na nkurume mgbe a na-akpọpụta ụdaume                       

     ma a na-enwe ya mgbe a na-akpọpụta mgbochiume.
-     Ụdaume niile na-ebu akara ụdaolu ma mgbochiume anaghị ebu.
-      Ụdaume kwụụrụ onwe ya nwere ike ịbụ otu nkejiokwu ma mgbochiume enweghị ike ịkwụrụ n’onwe ya dịka nkejiokwu.

-Ụdaume dị naanị asatọ ebe mgbochiume dị iri abụọ na asatọ.

-Ụdaume kere ụzọ abụọ n’usoro ndakọrịta ụdaume ma e nweghị ya na     mgbochiume.

-Ụdaume niile nwere ike ịkwusị mkpụrụokwu/ nkejiokwu ma               mgbochiume enweghị ike.

-Ụdaume na-enwe ụda aka ya mana mgbochiume anaghị enwe ụda nke aka ya.

 

(c)-   Mgbe a na-akpọpụta ụdaume ihu, ire na-aga ihu ebe ire na-ala azụ         

     mgbe a na-akpọpụta ụdaume azụ.

-Na mkpọpụta ụdaume ihu, egbugbere ọnụ na-ajasa ajasa ma na mkpọpụta ụdaume azụ, egbugbere ọnụ na-arụkọ/ na-adị ọrọghọrọ.

     
The candidates who attempted this question performed well.