Igbo Paper 2 WASSCE (PC), 2022

Question 5


Observation

 

Candidates were expected to (a) define a sentence and  (b) describe with examples some given types of sentences.
Expected answers:
(a)        -           Ahịrịokwu bụ otu mkpụrụokwu maọbụ karịa nke dị n’usoro ziri ezi, nwere                                   

ngwaa na echiche zuru ezu.
-           Ọ bụkwa nsokọ mkpurụokwu na mkpurụokwu na mkpurụokwu n’ụzọ                                           

kwesịrinụ nke nwere ngwaa, nwekwaa echiche zuru ezu.
-           Ọ bụ usorookwu nwere ngwaa na nghọta zuru oke.

(b)        (i)         Ahịrịajụjụ bụ ụdị ahịrịokwu na-achọ nzaghachi. Nke a bụ ahịrịokwu e ji                                        

ajụ ajụjụ.
Ọ bụ ahịrịokwu mmadụ ji achọ ịmata ihe ọ maghị.
-           Ị gara ebee?
-           I riri ji m?
-           Gịnị bụ aha gị?
-           Onye nọ ebe ahụ?

            (ii)        -           Ahịrịntimiwu bụ ahịrịokwu e ji amanye mmadụ ka o mee ihe a chọrọ.
-           Nke a na-agwa mmadụ ka o mee ihe ma ọ chọrọ ya maọbụ na                                                        

ọchọghị ya.
-         Ọ bụ ahịrịokwu na-enye iwu banyere ihe ọbụla a chọrọ ka e mee.
-           Pụọ ebe a ọsiịso.
-           E nyekwala ya mmanya ahụ.
-           Zaara m ụlọ.

            (iii)       - Ahirinkwusa bụ ụdịrị ahịrịokwu nke okwuu ji ekwusa etu ihe siri mee                                        

  maọbụ emeghi, etu ihe siri dị/ adịghị. O nwere ike idị n’ụdi nkwe maọbụnjụ.
- Ọ bụ ahịrịokwu na-ekwu maọbụ na-akọpụta maka ihe.
-           Onye nwụrụ anwụ anaghị apụta ụwa ọzọ.
-           Ezumike na-adị mma n’ahụ.
-           Iti mmọnwụ so n’omenala ndị Igbo.