Igbo Paper 2 WASSCE (PC), 2022

Question 11


Observation

 

Here, candidates were requested to (a)define the term ‘Ọfala’(b) give the benefits of ‘Ọfala’ and the duties of a traditional native doctor.
Expected answers:
(a) (i)  -    Ịgba Ọfala bụ mmemme naanị eze obodo na-eme iji gụọ afọ ma mee ncheta ọchịchị 
                 ya.
           - Ọ bụ oge eze na ndị ọ na-achị ji ahụkọrịta onwe ha anya, ṅụrịakwa ọṅụ, ma gụkọọ       
                 etu ihe siri gaa n’obodo n’afọ gara aga.

 (ii)      -     Ọ na-eweta aṅụrị n’obodo.
-     A na-enwe oriri na ọṅụṅụ n’oge a.
-     Eze na-eji ya gwa ndị obodo ihe ọ ga-emere ha.
-     Eze ji ya ekele Chukwu okike.
-     Eze ji oge a ekele ndị obodo ma gbakwaa ha ume n’ọrụ ha.
-     Ọ bụ oge ndị obodo ji ahụrịta onwe ha.
-     Ọ bụ oge ndị obodo ji enye eze onyinye dị icheiche.
-     Ọ bụ oge eze ji echi ndị mmadụ echichi.

(b)        -    Dibịa ọdịnala na-achọpụta ọdịnihu mmadụ maọbụ ọdịnihu obodo.
-    Ha na-achọpụta akaraaka mmadụ ma ọ dị mma/njọ.
-    Ha na-agba afa achọpụta ihe kpatara ọdachi ụfọdụ dịka ọnwụ ike ji adakwasa ụfọdụ mmadụ.
-    Ha na-agwa ndị mmadụ/ọha obodo ihe ndị mmụọ bu n’obi gbasara ha/ ihe ndịichie kwuru.
-    Ha na-ekwu ihe a ga-eji chụọ aja ma na-achụkwa aja ma nsogbu dakwasa obodo/ e merụọ ala.
-    Ọ bụ dibịa ọdịnala na-ekwu onye lọrọ mmadụ ụwa.
-    Mmadụ na-arịa oke ọria, ọ bụ dibịa ọdịnala na-achọpụta ihe kpatara ya ma gwọọ ya.
-    Ha na-anapụta ụmụ mmadụ n’aka ajọ mmụọ.
-    Ụfọdụ na-aha ma na-ejikwa mmiri.