Igbo Paper 2 WASSCE (PC 2ND), 2020

Question 3




Expected answers:

Observation


(a) - Ụdaume Igbo dị asatọ.

- E kere ụdaume ụzọ abụọ, ụdamfe na ụdaarọ.

- Mgbe a na-akpọpụta ụdaume, njiakpọ anaghị emetụ onwe ha/a na-eji nnokọ mkpaghe akpọpụta ha.

- Ụdaume niile bụ ụdandapụta.

- Mkpọụda na-ama jijiji mgbe a na-akpọpụta ụdaume niile.

- Ụdaume niile bụ ụdaọnụ.

- Ụdaume niile na-abụ umị nkejiokwu.

- Ụfọdụ ụdaume na-ebu ntụpọ n’odide ha ma ụfọdụ anaghị ebu.

- Ha nwere ike ịmalite maọbụ kwụsị mkpụrụokwu Igbo.

- Ụdaume na-ebu akara ụdaolu.

- Ụdaume nwere ụda aka ya.


(b) - Ụdaume na myiriụdaume nwere ụda nke aka ha.

- Ụdaume na myiriụdaume na-ebu akara ụdaolu.

- Ha abụọ na-eme ka mkpọụda maa jijiji na mkpọpụta ha.

- Ha nwere ike ịkwụụrụ onwe ha bụrụ nkejiokwu.

- Ha bụ mkpụrụụdaasụsụ Igbo.

- Ha nwere ike ibido mkpụrụokwu Igbo.

- Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịrụ ọrụ dịka nnọchiaha.

- Ha nwere iwu ha na-agbaso: Ụdaume - ndakọrịta ụdaume; myiriụdaume – ndagba myiriụdaume.

- Ha nwere ike kwụụrụ onwe ha burụ mkpụrụokwu.

- Ha bụcha ụda nge.