Igbo Paper 2 WASSCE (PC 2ND), 2022

Question 10

No question available

Observation

Candidates were expected to write  on some listed themes as seen in Ọjaadịlị.
Expected answers:
(a)    Ịhụnanya: Ụzọ ịhụnanya sipụta ihe
    -    Akwa Ọnụkwube bere mgbe Ọjaadịlị chọrọ ịga mgba.
    -    Akwa Ugomma bere mgbe Ọjaadịlị na-aga mgb.
    -    Nkweta Ọjaadilị kwetara ịgbara ndị obodo ya mgba.
    -    Mweputa Ogwumagana wepụtara onwe ya iduga Ọjaadilị mgba.
    -    Ịhụnanya Ọjaadịlị nwere n’ebe Udumeje, onye ọja ya nọ.
    -    Ndụmọdụ Ọkagbue nyere Ọjaadịlị ka ọ ghara ịga mgba

(b)    Mgba: Ụzọ mgba si pụta ihe
-    Ọjaadịlị gbara Otiaba iji zọpụta ndị Ụmụngodoo.
-    Ọ gbara ụmụọzọ mgba iji bọta ọbọ Udumeje ha gburu.
-    Ọjaadịlị gara mgba n’ala mmụọ iji turu ugo.
-    Otiaba gara mgba n’Ụmụngodo iji kparia ha.
-    Ọjaadịlị gbara Ikenga ya mgba.

(c)    Mpako Ụzọ mpako si pụta ihe
-    Mpako mere Otiaba jiri gaa mgba n’Ụmụngodo.
-    Ọ bụ mpako mere Ọjaadịlị jiri jee mgba n’ala mmụọ.
-    Mpako mere Ọjaadilị jiri jụ echichi ndị obodo ya chọrọ ichi ya.
-    Ọ bụ mpako mere Ọjaadịlị jiri cheere Ikenga ya aka mgba.

(d)    Ọnwụ: Ụzọ ọnwụ si pụta ihe
-    Ọzọ gburu Udumeje.
-    Ụfọdụ ụmụ mmụọ nwụrụ, a tụtee ha.
-    Ọjaadilị nwurụ na mgba ya na Ikenga, e mechaaa tụtee ya.
-    Otiaba, azụeruala, nwụrụ na mgba.

(e)    Isi ike: Etu isi ike si pụta ihe
-    Ọjaadịlị nupụụrụ ndị obodo ya isi oge ha chọrọ ichi ya echichi.
-    Ọjaadịlị nupụụrụ nne ya isi mgbe nne ya gwara ya agala mgba.
-    Ọjaadịlị nupuụrụ Ugonwa isi mgbe Ugonwa sịrị ya agala mgba.
-    Ọjaadịlị nupụụrụ Ọkagbue isi mgbe Ọkagbue sịrị ya agala mmgba.
-    Ọjaadilị nupụụrụ Ogwumana isi n’ala mmụọ mgbe Ogwumagana gwara ya ka ghara ịgbasa Ikenga mgba.